Abù Ọma 102:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu:Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja.

19. N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya;Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya;

20. Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ;Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;

21. Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion,Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;

22. Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù,Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè.

23. O wedawo ikem n'uzọ;O bilatawo ubọchim nile.

24. Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile:N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide.

25. Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.

26. Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide:Ha nile gāka kwa nká dika uwe;Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:

Abù Ọma 102