Abù Ọma 102:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova,Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:

16. N'ihi na Jehova ewuwo Zaion,O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya.

17. O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru,O ledaghi kwa ekpere-ha anya.

18. Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu:Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja.

19. N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya;Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya;

20. Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ;Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;

21. Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion,Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;

Abù Ọma 102