Abù Ọma 102:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, nuru ekperem,Ka ntikum ru kwa Gi nti.

2. Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu:Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ;N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.

3. N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku,Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.

4. Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua;N'ihi na echezọwom iri nrim.

5. Site n'olu ize-umemỌkpukpum araparawo n'anu-arum.

6. Eyirim okwolo nke ọzara;Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.

7. Amuruwom anya, we ghọIhe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo.

8. Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta;Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi.

9. N'ihi na eriwom ntu dika nri,Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum.

10. Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi:N'ihi na I buliwom elu, we tufuem.

11. Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu;Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.

12. Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi;Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.

13. Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion:N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.

14. N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ,Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.

15. Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova,Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:

Abù Ọma 102