4. Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú;Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim;Imi-gi di ka ulo-elu LebanonNke chere Damaskọs iru.
5. Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel,Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo;Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.
6. Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku,Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile!
7. Ogologo-gi nka yiri nkwu,Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine.
8. M'siri, M'gārigo elu nkwu,M'gējide igu-ya aka:Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine,Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple;