Abù Nke Abù 7:10-13 Bible Nso (IGBOB)

10. Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ,N'arum ka ọchichọ-ya di kwa.

11. Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia;Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà.

12. Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile;Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru,Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko:N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam.

13. Mandrake nile nēsì ísì utọ,Ọzọ, n'elu ọnu-uzọ-ayi nile ka nkpuru-osisi nile di oké ọnu-ahia di, nke-ọhu na nke-ochie,Nke m'kpakọbaworo gi, onye ihe-gi nātọm utọ.

Abù Nke Abù 7