1. Le, i mara nma, eyìm, le, i mara nma;Anya-gi abua di ka nduru n'azu ákwà-nkpuchi-gi:Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.
2. Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu,Nke siworo n'isa-aru rigota;Nke ha nile chi umu abua umu abua,Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.