8. Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia,Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile.
9. Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele:Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi,Ọ nēsi na window nile lebata anya,Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.
10. Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.
11. N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;
12. Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala;Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo,Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;
13. Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha,Osisi vine nile nāb͕awa okoko,Ha esìpuwo ísì utọ ha.Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.