7. Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya,Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie:N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi,N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?
8. Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom,Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu,Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.
9. Inyinyam nke di n'ub͕ọ-ala FeroKa m'wereworo gi tuara, gi eyìm.
10. Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa,Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.