Abù Nke Abù 1:5-8 Bible Nso (IGBOB)

5. Onye oji ka m'bu, ma amaram nma,Unu umu-ndinyom Jerusalem,Dika ulo-ikwū nile nke Kida,Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.

6. Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji,N'ihi na anyanwu achawom.Umu nke nnem wesaram iwe di ọku,Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile;Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.

7. Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya,Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie:N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi,N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?

8. Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom,Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu,Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.

Abù Nke Abù 1