Abù-Ákwá 5:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru:Legide anya, hu ita-uta-ayi.

2. Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ,Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.

3. Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.

4. Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.

5. Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi:Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.

Abù-Ákwá 5