14. Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.
15. Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.
16. Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.
17. Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi:N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.
18. Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n'amá nile ayi;Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n'ihi na ọgwugwu-ayi abiawo.