Abù-Ákwá 2:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n'iwe-Ya!O siwo n'elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n'ala,Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n'ubọchi iwe-Ya.

2. Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n'aru ha;Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya:O tidaruwo ha ala:O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ.

3. O bipuwo mpi nile ọ bula nke Israel n'iwe di ọku;O seghachiwo aka-nri-Ya azu site n'iru onye-iro:O rechapuwo kwa Jekob dika ọku nēnwu enwu, nke nēripia buruburu.

4. Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya dika onye-iro, O werewo aka-iri-Ya guzo Onwe-ya dika onye-nkpab͕u,We b͕ue ndi nile anya nāchosi ike:N'ulo-ikwū nke ada Zaion ka Ọ wusiworo ọnuma-Ya dika ọku.

Abù-Ákwá 2