3. Jọn 1:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. Onye m'huru n'anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula.

12. Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.

13. Enwerem ọtutu ihe idegara gi n'akwukwọ, ma achọghm iwere ink na pen degara gi:

14. ma anamele anya ihu gi ngwa ngwa, ayi gēwere kwa ọnu kwurita okwu.

15. Ka udo diri gi. Ndi-eyì-ayi nēkele gi. Nēkele ndi-eyì-ayi n'aha n'aha.

3. Jọn 1