4. ndi nārara madu nye n'aka ndi-iro-ha, ndi-isi-ike, ndi afuliworo elu, ndi nāhu ihe-utọ n'anya kama ihu Chineke n'anya;
5. ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu.
6. N'ihi na ha sitere na ndia, bú ndi nēb͕ebà nime ulo di iche iche, nādọta kwa ndinyom nēnweghi uche n'agha, bú ndi ekpokwasiworo ha nmehie, ndi agu ihe ọjọ di iche iche dufuworo,