9. Toi, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedadeza,
10. Toi we zíe Joram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedadeza agha, we tib͕ue ya: n'ihi na nwoke nke nēbuso Toi agha nke-uku ka Hadadeza bu. Ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo na ihe ọla di kwa n'aka Joram inye ya:
11. ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo nke o doro nsọ site na mba nile nke o budara;
12. site na Siria, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek, site kwa n'ihe-nkwata Hedadeza, nwa Rehob, bú eze Zoba.