2. Samuel 8:15-18 Bible Nso (IGBOB)

15. Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.

16. Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:

17. Zedok nwa Ahaitub, na Ahimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Seraia bu ode-akwukwọ;

18. Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.

2. Samuel 8