1. O rue, mb͕e eze biri n'ulo-ya, mb͕e Jehova me-kwa-ra ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu,
2. na eze siri Netan, bú onye-amuma, Biko, le, Mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e Chineke nēbi n'etiti ákwà-nkwuba.
3. Netan we si eze, Ihe nile nke di n'obi-gi, je, me ya; n'ihi na Jehova nọyere gi.
4. O rue, n'abali ahu, na okwu Jehova ruru Netan nti, si,
5. Je, si orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu gi onwe gi gēwurum ulo ibu ebe M'gēbi?
6. N'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka umu Israel si n'Ijipt rigota, we rue ta, kama M'nējeghari n'ulo-ikwū na n'ebe-obibim.
7. N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti umu Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù n'ebo Israel nile, nke M'nyere iwu izù ndim, bú Israel, si, N'ìhi gini ka unu newurughm ulo cedar?
8. Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel:
9. M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.
10. M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu,