2. Samuel 6:4-8 Bible Nso (IGBOB)

4. Ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà, ya na ib͕e Chineke: Ahio we nēje n'iru ib͕e ahu.

5. Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n'iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà.

6. Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Nakon, Uza we setia aka-ya rue ebe ib͕e Chineke di, jide ya, n'ihi na ehi nāb͕a ukwu.

7. Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.

8. Iwe Devid we di ọku n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: ọ we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.

2. Samuel 6