3. ndi Beirot we b͕alaga na Gitaim, buru ndi-ọbìa n'ebe ahu rue ta.)
4. Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet.
5. Umu Rimon onye Beirot, bú Rikab na Beana, we je, biarue ulo Ish-boshet dika n'ikpo-ọku nke ehihie, ma ya onwe-ya nēdina ndina etiti-ehihie.
6. Ma n'ebe ahu ka ha biara rue etiti ulo, dika ha nēwere ọka wheat; ha we tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise: Rikab na Beana, bú nwa-nne-ya, we wepuga onwe-ha.
7. Ma mb͕e ha batara n'ulo, ka ya onwe-ya nēdina n'ihe-ndina-ya n'ime-ulo-ndina-ya, ha we tib͕ue ya, me ka ọ nwua, wezuga isi-ya, were isi-ya, je ije n'uzọ Araba abali ahu nile.
8. Ha we butere Devid isi Ish-boshet rue Hebron, si eze, Le, isi Ish-boshet nwa Sọl, bú onye-iro-gi, nke chọrọ ndu-gi; ma Jehova abọworo onye-nwem, bú eze, ọ́bọ̀ ta n'aru Sọl, na n'aru nkpuru ya.
9. Devid we za Rikab na Beana nwa-nne-ya, bú umu Rimon onye Beirot, si ha, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,