2. Samuel 24:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ, na n'aru ndi-isi usu-ndi-agha. Joab na ndi-isi usu-ndi-agha we si n'iru eze pua igukọta ndi ahu, bú Israel.

5. Ha we gabiga Jọdan, ma ulo-ikwū-ha n'Aroea, n'aka-nri obodo ahu nke di n'etiti ndagwurugwu Gad, we rue Jeza:

6. ha we biarue Gilead, ru kwa ala Tahtim-họdshi; ha we biarue Dan-jaan, je buruburu rue Zaidon,

7. biarue ebe ewusiri ike nke Taia, na obodo nile nke ndi-Haivait na ndi Kenean, purue Negeb Juda, nime Bia-sheba.

8. Ha we jegharia n'ala nile, biarue Jerusalem n'ọgwugwu ọnwa iteghete na orú ubọchi.

9. Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n'Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri.

2. Samuel 24