3. Joab we si eze, Ka Jehova, bú Chineke-gi, tukwasi-kwa-ra ndi Israel, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise, ka anya onye-nwem, bú eze, hu kwa ya: ma onye-nwem, bú eze, n'ìhi gini ka ihe a nātọ ya utọ?
4. Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ, na n'aru ndi-isi usu-ndi-agha. Joab na ndi-isi usu-ndi-agha we si n'iru eze pua igukọta ndi ahu, bú Israel.
5. Ha we gabiga Jọdan, ma ulo-ikwū-ha n'Aroea, n'aka-nri obodo ahu nke di n'etiti ndagwurugwu Gad, we rue Jeza: