2. Samuel 24:18-23 Bible Nso (IGBOB)

18. Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.

19. Devid we rigo dika okwu Gad si di, dika Jehova nyere n'iwu.

20. Arọna we le anya, hu eze na ndi-orù-ya ka ha nāgabigakute ya: Arọna we puta, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala.

21. Arọna we si, Gini mere onye-nwem, bú eze, biakuteworo orù-ya? Devid we si, Izuru ebe-nzọcha-ọka-gi n'aka-gi, iwuru Jehova ebe-ichu-àjà, ka ewe b͕ochie ihe otiti a n'ebe ndi Israel nọ.

22. Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú:

23. ihe a nile onye-nwem eze ka Arọna, nyere eze. Arọna we si eze, Ka ihe-gi tọ Jehova, bú Chineke-gi, utọ

2. Samuel 24