2. Samuel 21:8-22 Bible Nso (IGBOB)

8. Eze we chiri umu-ndikom abua nke Rizpa nwa-nwayi Aia, ndi ọ muru Sọl, bú Amoni na Mefiboshet; na umu-ndikom ise nke Maikal nwa-nwayi Sọl, ndi ọ muru Adriel nwa Bazilai onye Mehola:

9. o we nye ha n'aka ndi Gibeon, ha we kwuba ha n'ugwu n'iru Jehova: ha asa we da n'otù: ma emere ka ndi ahu nwua n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, n'ubọchi mbu, na nmalite obìbì ọka barley.

10. Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n'elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n'elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n'ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n'abali.

11. Ewe gosi Devid ihe Rizpa nwa Aia, nwayi bu iko Sọl, mere.

12. Devid we je chiri ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya n'aka ndi-nwe Jebesh-gilead, ndi zupuru ha n'amá Bet-shan, ebe ndi Filistia kwubara ha, n'ubọchi ndi Filistia tib͕uru Sọl nime Gilboa:

13. o we si n'ebe ahu chigota ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya; ha chikọta-kwa-ra ọkpukpu ndi akwubara.

14. Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n'ala Benjamin nime Zela, n'ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n'iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri.

15. Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà.

16. Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.

17. Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.

18. O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha di kwa ọzọ na Gob nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Saf, nke di n'etiti umu Rafa.

19. Agha we di ọzọ na Gob ebusoro ndi Filistia; Elhanan nwa Jaare-oregim onye Bet-lehem we tib͕ue nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.

20. Agha we di ọzọ na Gat, ma otú nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ọnu-ọgugu-ha di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.

21. Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimai, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.

22. Madu anọ ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.

2. Samuel 21