1. Oké unwu we di n'ubọchi Devid arọ atọ n'usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n'ihi Sọl na n'ihi ulo ọbara ya, n'ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua.
2. Eze we kpọ ndi Gibeon, si ha; (ma ndi Gibeon, ọ bughi n'umu Israel ka ha sitere, kama ha sitere na ndi-Amorait fọduru; ma umu Israel ṅuru ha iyi: ma Sọl chọrọ itib͕u ha n'ekworo n'ihi umu Israel na Juda:)
3. Devid we si ndi Gibeon, Gini ka m'gēmere unu? gini kwa ka m'gēji kpuchie nmehie, ka unu we gọzie ihe-nketa Jehova?
4. Ndi Gibeon we si ya, Ọ dighi ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo diri ayi n'ebe Sọl nọ, ma-ọbu n'ebe ulo-ya nọ: ọ dighi kwa nwoke ọ bula agēme ka ọ nwuara ayi n'Israel. O we si, Ihe unu onwe-unu nāsi, ihe ahu ka m'gēmere unu.
5. Ha we si eze, Nwoke ahu nke mere ka ayi gwusia, nke zube-kwa-ra imegide ayi, ewe kpochapu ayi ka ayi ghara iguzo onwe-ayi n'ókè-ala ọ bula nke Israel,
6. ka enye ayi ndikom asa sitere n'umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha.
7. Ma eze nwere ọmiko n'aru Mefiboshet, nwa Jonatan nwa Sọl, n'ihi ọṅuṅu-iyi Jehova nke di n'etiti ha, bú n'etiti Devid na Jonatan nwa Sọl.
8. Eze we chiri umu-ndikom abua nke Rizpa nwa-nwayi Aia, ndi ọ muru Sọl, bú Amoni na Mefiboshet; na umu-ndikom ise nke Maikal nwa-nwayi Sọl, ndi ọ muru Adriel nwa Bazilai onye Mehola: