2. Samuel 19:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ewe gosi Joab, si, Le, eze nākwa ákwá, nēru-kwa-ra Absalom újú.

2. Nzọputa we ghọrọ ndi Devid nile iru-újú n'ubọchi ahu: n'ihi na ndi Devid nuru n'ubọchi ahu, si, Ọ nēwuta eze n'ihi nwa-ya.

3. Ndi Devid we ghèré bà n'obodo n'ubọchi ahu, dika ndi ihere nēme nēghepu mb͕e ha nāb͕alaga n'agha.

4. Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!

2. Samuel 19