2. Samuel 17:21-24 Bible Nso (IGBOB)

21. O rue, mb͕e ha lasiri, na ha siri n'olùlù-miri ahu rigota, je, gosi eze, bú Devid; ha we si Devid, Bilienu, gabiga miri ngwa ngwa; n'ihi na otú a ka Ahitofel duworo ọdu megide unu.

22. Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan.

23. Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.

24. Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.

2. Samuel 17