6. Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n'aka-nri-ya na n'aka-ekpe-ya.
7. Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:
8. Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu.
9. Abishai nwa Zeruaia we si eze, N'ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m'gabiga, wezuga isi-ya.
10. Eze we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ umu Zeruaia? mb͕e ọ nākọcha, mb͕e Jehova siwo-kwa-ra ya, Kọcha Devid; ònye gāsi kwa, Gini mere i meworo otú a?