21. Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike.
22. Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n'elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n'anya Israel nile.
23. Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n'okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n'ebe Devid nọ ma n'ebe Absalom nọ.