25. Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu!Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.
26. Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan:I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ:Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube,Kari ihu-n'anya ndinyom.
27. Ndi-dike esiwo aṅa da!Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!