2. (n'ihi na Ọ nāsi,N'oge anānara madu nke-ọma ka M'nuru olu-gi,Ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'yere gi aka:le, ub͕u a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ub͕u a bu ubọchi nzọputa):
3. ayi adighi-eme ihe-isu-ngọngọ ọ bula n'ihe ọ bula, ka aghara ita ije-ozi-ayi uta;
4. kama n'ihe nile ayi nēme ka madu mara ayi, dika ndi nējere Chineke ozi, nime oké ntachi-obi, nime nkpab͕u, nime nkpà, nime oké nkpà,
5. nime ihe-otiti, nime ulo-nkpọrọ, nime aghara, nime idọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nime imuru-anya, nime obubu-ọnu;
6. nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,