2. Ndi Kọrint 5:13-15 Bible Nso (IGBOB)

13. N'ihi na asi na ayi buru ndi anya nādighi nma, ọ bu n'ebe Chineke nọ; asi kwa na ayi nwere uche zuru okè, ọ bu n'ebe unu nọ.

14. N'ihi na ihu-n'anya Kraist nērugide ayi; ebe ayi nātule nka, na otù Onye nwuru n'ọnọdu madu nile, ya mere madu nile nwuru;

15. Ọ nwu-kwa-ra n'ọnọdu madu nile, ka ndi di ndu we ghara idiri onwe-ha ndu ọzọ, kama ka ha diri Onye ahu ndu, bú Onye nwuru n'ọnọdu ha, eme kwa ka O si n'ọnwu bilie.

2. Ndi Kọrint 5