2. Ndi Kọrint 13:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.

2. Agwawom ha n'oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n'oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m'nọ n'etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m'gaghi-eme ebere;

3. ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:

2. Ndi Kọrint 13