2. Ndi Kọrint 12:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Aghaghi m inya isi, ọ bu ezie na ọ baghi urù; ma m'gēche iru n'ọhù na ihe-nkpughe nke Onye-nwe-ayi.

2. Amataram otù madu nime Kraist, arọ iri na anọ gara aga (ma ọ bu nime aru, amataghi m; ma-ọbu na ọ bughi nime aru, amataghm; Chineke matara), na eweliri madu di otú a na mberede rue elu-igwe nke-atọ.

3. Amata-kwa-ram madu di otú a (ma ọ bu nime aru, ma-ọbu na aru anọghi ya, amataghi m; Chineke matara),

4. na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n'iwu ka madu kwue ha.

2. Ndi Kọrint 12