2. Ndi Kọrint 11:29-33 Bible Nso (IGBOB)

29. Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n'adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n'ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n'ihi ya?

30. Ọ buru na aghaghi m inya isi, m'gānya isi n'ihe nke diri adighi-ikem.

31. Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha.

32. Nime Damaskọs onye-isi ala nke nọ n'okpuru Aretas, bú eze, nēche obodo ndi Damaskọs nche, ijidem:

33. site kwa na window ka esi na mb͕idi radam n'ihe akpara akpa, m'we b͕apu n'aka-ya.

2. Ndi Kọrint 11