8. N'ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n'Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu:
9. e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie:
10. Onye dọputara ayi n'oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ;
11. ebe unu nēyekọ kwa aka n'ihi ayi n'aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n'ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n'aka ọtutu madu.
12. N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.
13. N'ihi na ayi edegaraghi unu ihe ọzọ n'akwukwọ, ma-ọbughi ihe unu nāghọta ma-ọbu nke unu nāmazu kwa, anamele kwa anya na unu gāmazu ha rue ọgwugwu ihe nile:
14. dika unu mazu-kwa-ra ayi n'otù akuku, na ayi bu ihe-inya-isi-unu, ọbuná dika unu onwe-unu bu kwa ihe-inya-isi nke ayi, n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.
15. Nime ntukwasi-obi a ka m'zube-kwa-ra na mbu ibiakute unu, ka unu we nwe amara nke-abua;
16. ka m'we site kwa n'iye-aka-unu je rue Masedọnia, si kwa na Masedọnia biakute unu ọzọ, ka unu we dupukwam n'ijem iga Judia.
17. Ya mere mb͕e m'zubere nka, ọ̀ gābu na ejim uche nāgha agha zube? ma-ọbu ihe m'nēzuputa, ànamezuputa ha dika anu-aru nāgwam, ka e e na é-è é-è we di n'ọnum n'otù oge?
18. Ma dika Chineke kwesiri ntukwasi-obi, okwu-ayi nke ayi gwara unu abughi e na é-è.
19. N'ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n'etiti unu site n'ọnu-ayi, bú site n'ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.