21. Ma Onye ahu Nke nēme ka ayi na unu guzosie ike nime Kraist, Onye te-kwa-ra-ayi manu n'isi, bu Chineke;
22. Onye ka-kwa-ra ayi akàrà, nye kwa ayi Mọ Nsọ n'obi-ayi, bú ihe ayi ji mara na ayi gēnwezu nkwa ahu nile.
23. Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.
24. Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n'ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.