17. Ya mere mb͕e m'zubere nka, ọ̀ gābu na ejim uche nāgha agha zube? ma-ọbu ihe m'nēzuputa, ànamezuputa ha dika anu-aru nāgwam, ka e e na é-è é-è we di n'ọnum n'otù oge?
18. Ma dika Chineke kwesiri ntukwasi-obi, okwu-ayi nke ayi gwara unu abughi e na é-è.
19. N'ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n'etiti unu site n'ọnu-ayi, bú site n'ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.
20. N'ihi na ka ha ra, bú nkwa nke Chineke, ọ bu nime Ya ka e di: n'ihi nka ka Amen site-kwa-ra n'aka-Ya, ka ewe site n'aka-ayi nye Chineke otuto.
21. Ma Onye ahu Nke nēme ka ayi na unu guzosie ike nime Kraist, Onye te-kwa-ra-ayi manu n'isi, bu Chineke;
22. Onye ka-kwa-ra ayi akàrà, nye kwa ayi Mọ Nsọ n'obi-ayi, bú ihe ayi ji mara na ayi gēnwezu nkwa ahu nile.
23. Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.
24. Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n'ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.