2. Ndi-Eze 9:3-7 Bible Nso (IGBOB)

3. Gi were kwa karama manu ahu, wukwasi ya n'isi-ya, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Meghe kwa uzọ, b͕alaga, eche-kwa-la eche.

4. Nwa-okorọbia ahu, ọbuná nwa-okorọbia ahu, bú onye-amuma, we jerue Remot-gilead.

5. Ọ bia, ma, le, ndi-isi usu-ndi-agha nanọdu ala; ọ si, Enwerem okwu igwa gi, onye-isi. Jihu we si, Ọ̀ bu onye nime ayi nile? Ọ si, Ọ bu gi, onye-isi.

6. O bilie, ba n'ulo; ọ wukwasi manu ahu n'isi-ya, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Etewom i manu ibu eze ndi Jehova, bú Israel.

7. I gētib͕u kwa ulo Ehab, bú onye-nwe-gi, ka M'we bọ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orùm, bú ndi-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke Jehova, n'aka Jezebel.

2. Ndi-Eze 9