2. Ndi-Eze 9:12-16 Bible Nso (IGBOB)

12. Ha si, Ọ bu okwu-ugha; biko, gosi ayi. Ọ si, Otú a na otú a ka ọ gwaram, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel.

13. Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.

14. Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi we kekọta madu imegide Joram. (Ma Joram nēche Remot-gilead, ya onwe-ya na Israel nile, n'ihi Hazael, bú eze Siria:

15. ma Jehoram, bú eze, laghachiri ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u nke ndi Siria tib͕uru ya, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha.) Jihu we si, Ọ buru na nka bu uche-unu, ka onye-nb͕apu ghara isi n'obodo a pua ije igosi ya nime Jezreel.

16. Jihu we nọdu n'ub͕ọ-ala, jerue Jezreel; n'ihi na Joram nēdina n'ebe ahu. Ma Ehazaia, bú eze Juda, ridatara ihu Joram.

2. Ndi-Eze 9