2. Ndi-Eze 7:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. Eze we bilie n'abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m'gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n'ọhia, si, Mb͕e ha siri n'obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n'obodo-ha.

13. Otù nime ndi-orù-ya we za, si, Biko, ka achiri inyinya ise nime inyinya fọduru, nke fọduru nime ya, (le, ha di ka ìgwè nile nke Israel nke fọduru nime ya; le, ha di ka ìgwè nile nke Israel ndi gwusiri agwusi:) ka ayi ziga hu kwa.

14. Ha we chiri ub͕ọ-ala abua, ha na inyinya; eze we ziga ha iso ọmuma-ulo-ikwū Siria, si, Jenu, hu.

15. Ha we jeso ha rue Jọdan: ma, le, uzọ nile juputara n'uwe na ihe, nke ndi Siria tufuru n'ime-ngwa-ngwa-ha. Ndi-ozi we lata, gosi eze.

16. Ndi Israel we pua, luta ọmuma-ulo-ikwū Siria n'agha. Ewe re otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, dika okwu Jehova si di.

17. Eze we me ka onye-isi-agha ahu, bú onye ọ nādabere n'aka-ya, lekọta ọnu-uzọ-ama: ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua dika onye nke Chineke kwuru, onye kwuru mb͕e eze ridakuru ya.

18. O rue, dika onye nke chineke gwara eze okwu, si, Agēre mb͕é barley abua otù shekel, na otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, dika mb͕è a echi, n'ọnu-uzọ-ama Sameria;

19. onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya:

20. o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.

2. Ndi-Eze 7