31. O we si, Ka Chineke mem otú a, ka O me kwa ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na isi Elaisha nwa Shefat gēguzo n'aru ya ta.
32. Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya?
33. Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, le, onye-ozi ahu nāridakuru ya: ọ si, Le, ihe ọjọ a sitere n'aka Jehova; gini mere m'nēle anya Jehova ọzọ?