2. Ndi-Eze 25:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. Ewe nānọchigide obodo ahu n'agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia.

3. N'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.

4. Ewe tipue obodo, ndikom agha nile we b͕apu n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige: (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) eze we je n'uzọ Araba.

5. Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue ya aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia.

6. Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.

2. Ndi-Eze 25