19. o si-kwa-ra n'obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha: na ndikom ise nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n'obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n'obodo.
20. Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon rue Ribla.
21. Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Eze we me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.