1. O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadneza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ọ ma ulo-ikwū megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.
2. Ewe nānọchigide obodo ahu n'agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia.
3. N'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.