2. Ndi-Eze 24:3-15 Bible Nso (IGBOB)

3. N'ezie n'okwu-ọnu Jehova ka ihe a di n'aru Juda, isi n'iru Ya wezuga ha, n'ihi nmehie nile nke Manase, dika ihe nile si di nke o mere;

4. ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.

5. Ma okwu Jehoiakim nile fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

6. Jehoiakim we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

7. Ma eze Ijipt esighi n'ala-ya puta ọzọ ma-ọli: n'ihi na eze Babilon ewerewo ihe nile eze Ijipt nwere site na miri-iyi Ijipt rue osimiri Yufretis.

8. Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem.

9. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

10. Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n'agha.

11. Nebukadneza, bú eze Babilon, we biarue obodo ahu, mb͕e ndi-orù-ya nānọchigide ya n'agha;

12. Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.

13. O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.

14. O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n'ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.

15. O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

2. Ndi-Eze 24