2. Ndi-Eze 21:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hefzi-ba.

2. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.

3. Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n'iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.

4. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M'gētiye aham.

5. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova.

6. O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.

2. Ndi-Eze 21