2. Ndi-Eze 18:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-atọ nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Hezekaia nwa Ehaz, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2. Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abi nwa-nwayi Zekaraia.

3. O me ihe ezi ziri n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.

4. Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n'ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan.

5. Ọ bu na Jehova, bú Chineke Israel, ka ọ tukwasiri obi; mb͕e ọ nwusiri ọ dighi kwa onye ọzọ di ka ya n'etiti eze nile nke Juda, ma-ọbu n'etiti ndi buru ya uzọ.

2. Ndi-Eze 18