2. Ndi-Eze 16:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. Ọ we sure àjà-nsure-ọku-ya ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, sure kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, wusi kwa àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, wusa kwa ọbara àjà-udo-ya nile, n'elu ebe-ichu-àjà ahu.

14. Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke di n'iru Jehova, o si n'iru ulo ahu, si n'etiti ebe-ichu-àjà-ya na ulo Jehova, bute ya nso, tiye ya n'akuku Ugwu ebe-ichu-àjà-ya.

15. Eze, bú Ehaz, we nye Uraija, bú onye-nchu-àjà, iwu, si, N'elu ebe-ichu-àjà uku ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku ututu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, na àjà-nsure-ọku nke eze, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, ha na àjà-nsure-ọku nke ndi nile nke ala nka, na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha; ọbara nile nke àjà-nsure-ọku, na ọbara nile nke àjà, n'elu ya ka i gāwusa kwa ya: ma ebe-ichu-àjà ọla ahu gādirim iji ju ase.

16. Uraija, bú onye-nchu-àjà, we me ya, dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, nyere ya n'iwu.

17. Eze, bú Ehaz, we bipu ihe-njikọ nile nke ihe-ndọkwasi nile, si n'elu ha wezuga ite ọsisa-miri: o si-kwa-ra n'elu ehi ọla nke di n'okpuru ya weda oké osimiri ahu, tiye ya n'elu pavement nkume.

2. Ndi-Eze 16