1. N'arọ nke-iri-na-asa nke Peka nwa Remalaia ka Ehaz nwa Jotam, bú eze Juda, malitere ibu eze.
2. Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya, dika Devid nna-ya.
3. Ma o jere ije n'uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.
4. Ọ chua àjà, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula.
5. Mb͕e ahu Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rigoruru Jerusalem ibu agha: ha we nọchigide Ehaz n'agha, ma ha apughi ibu agha.
6. Na mb͕e ahu ka Rezin, bú eze Siria, weghachiri Ilat nye Siria, chupu ndi-Ju n'Ilot: ndi Siria we ba n'Ilat, biri n'ebe ahu, rue ta.
7. Ehaz we zigara Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, ndi-ozi, si, Orù-gi na nwa-gi ka m'bu: rigota, zọputam n'aka eze Siria na n'aka eze Israel, ndi nēbili imegidem.
8. Ehaz we chiri ọla-ọcha na ọla-edo anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, zigara eze Asiria ka ọ buru ihe-iri-ngo.
9. Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua.