9. Jehoash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.
10. I tib͕uwo Edom n'ezie, obi-gi we bulie gi elu: ka asọpuru gi na nka, nọdu kwa n'ulo-gi; ma n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?
11. Ma Amazaia anughi. Jehoash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere.
12. Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.
13. Jehoash, bú eze Israel, we jide Amazaia, bú eze Juda, nwa Jehoash nwa Ehazaia, nime Bet-shemesh, we biarue Jerusalem, tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.